12Obodo ndị a ga-abụ ebe mgbaba nye onye na-ezere ndụ site nʼaka onye ahụ chọrọ ịbọrọ ọbọ, ka a ghara igbu onye e boro ebubo igbu mmadụ tutu ruo mgbe e buru ụzọ kpee ya ikpe nʼihu ọgbakọ.
13Obodo isii ndị a unu wepụtara ga-abụ obodo mgbaba.
14Họpụta obodo mgbaba atọ nʼakụkụ ọzọ nke Jọdan. Ka atọ ndị ọzọ dịrị na Kenan.
15Obodo ndị a agaghị abụ ebe izere ndụ maka naanị ndị Izrel, kama ọ dịkwara ndị ọbịa na ndị ọzọ bi nʼetiti unu, ka onye na-akpachaghị anya gbuo mmadụ gbaga ebe ahụ izere ndụ ya.
16“ ‘Ọ bụrụ na mmadụ e jiri mkpirisi igwe tigbuo mmadụ ibe ya, a ga-agụ onye dị otu a dịka ogbu mmadụ. A ga-egbukwa ya.