Ọnụọgụgụ 35

“ ‘Ma ọ bụrụ na mmadụ ebughị iro nʼobi nutuo mmadụ ibe ya na mberede, maọbụ tụọ ya ihe,

Numbers 35:22 (UKJV) But if he thrust him suddenly without enmity, or have cast upon him any thing without laying of wait,

20Ọ bụrụ na mmadụ esite nʼekworo nuo onye ọzọ aka, maọbụ kpachara anya tụọ onye ahụ ihe nke mere ka ọ nwụọ,

21maọbụ na o sitere nʼobi ọnụma jiri aka ya tie mmadụ ihe nke mere ka ọ nwụọ, a ga-egbu onye ahụ, nʼihi na ogbu mmadụ ka ọ bụ. Onye na-agwachite ọchụ ga-egbu ogbu mmadụ ahụ mgbe ọbụla o zutere ya.

22“ ‘Ma ọ bụrụ na mmadụ ebughị iro nʼobi nutuo mmadụ ibe ya na mberede, maọbụ tụọ ya ihe,

23maọbụ tụtuo nkume nke datara dagbuo mmadụ ibe ya mgbe ọ na-ahụghị ya, bụ onye na-abụghị onye iro ya, onye ọ na-ebughị nʼobi imejọ,

24mgbe ahụ, ndị ọgbakọ ga-ekpe ikpe nʼetiti onye e boro ebubo na onye na-agwachite ọchụ dịka usoro iwu ndị a si dị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.