29“ ‘Ndị a bụ usoro iwu ga-adịgide nye unu site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ, nʼebe obibi unu niile.
30“ ‘Onye ọbụla gburu mmadụ ga-anwụ. A ga-ama ya ikpe ọnwụ naanị mgbe e nwere karịa otu onye akaebe. Ọ dịghị onye ọbụla a ga-egbu nʼihi akaebe nke otu onye gbara megide ya.
31“ ‘Unu a narakwala ihe ịgbara isi nʼọnọdụ ndụ nke onye gburu mmadụ, bụ onye nke ikpe ọnwụ mara. Aghaghị ime ka ha nwụọ.
32“ ‘Unu a narakwala ihe mgbapụta site nʼaka onye ọbụla nke gbagara nʼobodo mgbaba, site otu a kwere ka ha lọghachite azụ ga biri nʼala nke aka ha tupu onyeisi nchụaja anwụọ.
33“ ‘Unu emerụkwala ala ahụ nke unu bi nʼime ya. Ọbara igbu ọchụ na-emerụ ala. Ọ dịkwaghị mkpuchi mmehie a ga-eme banyere ala a wufuru ọbara nʼime ya, ma ọ bụghị naanị ọbara nke onye ahụ gburu ọchụ ahụ.