32tinyere ogidi osisi niile dị ogige ahụ gburugburu na ụkwụ ha niile, ǹtu niile, ụdọ ha niile na ngwongwo ndị ọzọ e ji arụ ọrụ metụtara ihe ndị a ha ga-ebu. Kenye nwoke ọbụla ọrụ nke ya. Kpọ onye ahụ aha nye ya ọrụ nke ya.
33Nke a bụ ọrụ dịịrị ndị agbụrụ Merari mgbe ha na-aga ozi ha nʼụlọ nzute. Ha ga-anọ nʼokpuru Itama, nwa Erọn, onye nchụaja, onye bụ onyeisi ha.”
34Ya mere, Mosis na Erọn na ndị ndu nzukọ ụmụ Izrel gụrụ ma chọpụta ọnụọgụgụ ụmụ Kohat, dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
35Ndị ikom niile gbara iri afọ atọ ruo iri afọ ise, ndị toruru ije ozi nʼụlọ nzute ahụ
36dịka ikwu ha si dị bụ puku abụọ na narị asaa na iri ise (2,750).