40dịka ikwu ha si dị bụ puku abụọ na narị isii na iri atọ (2,630).
41Ndị a niile bụ ndị si nʼikwu Geshọn ndị na-eje ozi nʼụlọ nzute. Mosis na Erọn gụrụ ha ọnụ dịka iwu Onyenwe anyị nyere Mosis si dị.
42A gụrụ ụmụ Merari ọnụ dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
43Ndị ikom niile gbara iri afọ atọ ruo iri afọ ise ndị toruru ije ozi nʼụlọ nzute
44dịka ikwu ha si dị bụ puku atọ na narị abụọ (3,200).