29“ ‘Nke a bụ iwu metụtara ikwo ekworo mgbe nwanyị bi nʼụlọ di ya kpafuru merụọ onwe ya.
30Maọbụ mgbe ekworo jupụtara nwoke nʼobi nʼihi na ọ gụrụ nwunye ya dịka onye na-ekwesighị ntụkwasị obi. Onye nchụaja ga-eme ka nwanyị a guzo nʼihu Onyenwe anyị, mezuokwa ihe niile nʼusoro dịka e si depụta ha nʼebe a.
31A gaghị ama di nwanyị a ikpe dịka onye mere ihe ọjọọ, kama nwanyị a ga-ebu ahụhụ ya na mmehie ya naanị ya.’ ”