Ọnụọgụgụ 6

Nʼoge niile nke ikewapụ onwe ya, onye e doro nsọ nye Onyenwe anyị ka ọ bụ.

Numbers 6:8 (UKJV) All the days of his separation he is holy unto the LORD.

6“ ‘Nʼime oge niile nke imezu nkwa ikewapụ onwe ya nye Onyenwe anyị, ọ gaghị aga nso mmadụ ọbụla nwụrụ anwụ,

7ọ bụladị na nna ya, maọbụ nne ya, maọbụ nwanne ya nwoke, maọbụ nwanne ya nwanyị anwụọ. Ọ gaghị emerụ onwe ya nʼihi ha, nʼihi na akara ikewapụ onwe ya iche nye Chineke dị ya nʼisi.

8Nʼoge niile nke ikewapụ onwe ya, onye e doro nsọ nye Onyenwe anyị ka ọ bụ.

9“ ‘Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ na mberede nʼakụkụ onye nazirait, si otu a merụọ agịrị isi ya nke na-egosi ido nsọ ya, ọ ghaghị ịkpacha isi ya nʼụbọchị nke asaa bụ ụbọchị ime ka ọ dị ọcha.

10Nʼụbọchị nke ọzọ ya, bụ nʼụbọchị nke asatọ. Ọ ghaghị iwetara onye nchụaja nduru abụọ maọbụ ụmụ kpalakwukwu abụọ, nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.