12Ya mere, Nashọn nwa Aminadab onye si nʼebo Juda wetara onyinye nke ya nʼụbọchị nke mbụ.
13Onyinye o wetara bụ: efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, dịka ihe ọtụtụ shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere abụọ ndị a ụtụ ọka a gwara mmanụ maka onyinye mkpụrụ ọka.
14O wetara otu efere ọlaedo, nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ.
15O wetakwara otu nwa oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule nke gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ.
16O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie,