Ọnụọgụgụ 7

Nʼụbọchị nke anọ, Elizọ nwa Shedeua onyendu ebo Ruben wetara onyinye nke ya.

Numbers 7:30 (UKJV) On the fourth day Elizur the son of Shedeur, prince of the children of Reuben, did offer:

28O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie,

29na ehi abụọ, na ebule ise, mkpi ise, na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo. Nke a bụ onyinye Eliab nwa Helọn wetara.

30Nʼụbọchị nke anọ, Elizọ nwa Shedeua onyendu ebo Ruben wetara onyinye nke ya.

31Onyinye o wetara bụ: otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka.

32O wetara otu efere ọlaedo, nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.