56O wetara otu efere ọlaedo, nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ.
57O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ.
58O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie,
59ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo. Nke a bụ onyinye Gamaliel nwa Pedazo nyere.
60Nʼụbọchị nke itoolu, Abidan nwa Gidiọn onyendu ebo Benjamin nyere onyinye nke ya.