72Nʼụbọchị nke iri na otu, Pagịel nwa Okran, onyendu ebo Asha butere onyinye nke ya.
73Onyinye o wetara bụ: otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka.
74O wetara otu efere ọlaedo, nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ.
75O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ.
76O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie,