Ọnụọgụgụ 7

O wetara otu efere ọlaedo nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ.

Numbers 7:80 (UKJV) One golden spoon of ten shekels, full of incense:

78Nʼụbọchị nke iri na abụọ, Ahira nwa Enan, onyendu ebo Naftalị nyere onyinye nke ya.

79Onyinye o wetara bụ: otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka.

80O wetara otu efere ọlaedo nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ.

81O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ.

82O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.