19Site nʼetiti ndị Izrel niile, ewerela m ndị Livayị nye Erọn na ụmụ ya ndị ikom dịka onyinye, ka ha rụọ ọrụ niile dị nʼime ụlọ nzute ahụ nʼọnọdụ ụmụ Izrel. Ka ha kpuchiere ha mmehie ha niile ka ihe otiti nke nrịa nrịa ghara ịbịakwasị ụmụ Izrel, mgbe ọbụla ha bịara nso ebe nsọ ahụ.”
20Ya mere, Mosis na Erọn na nzukọ niile nke ụmụ Izrel chere ụmụ Livayị nʼihu Onyenwe anyị, nʼusoro dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
21Ndị Livayị niile doro onwe ha ọcha, sachakwaa uwe ha niile. Erọn chere ha nʼihu Onyenwe anyị dịka onyinye aja mfufe, chụọrọ ha aja ikpuchi mmehie, ime ka ha dị ọcha.
22Nʼikpeazụ, ndị Livayị bịara ije ozi ha nʼụlọ nzute nʼokpuru Erọn na ụmụ ya ndị ikom. Ha nyekwara ndị Livayị ọrụ dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
23Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,