4Ya mere, Mosis gwara ndị Izrel sị ha mee Mmemme Ngabiga.
5Ha mekwara ya nʼọzara Saịnaị malite nʼuhuruchi abalị iri na anọ nke ọnwa mbụ. Ndị Izrel mere ihe niile nʼusoro dịka iwu Onyenwe anyị nyere Mosis si dị.
6Ma ụfọdụ nʼime ụmụ Izrel esoghị mee Mmemme Ngabiga ahụ nʼihi na ha rụrụ arụ site nʼịnọ ozu nso. Nʼihi ya, ha bịakwutere Mosis na Erọn nʼụbọchị ahụ,
7sị Mosis, “Anyị ghọrọ ndị rụrụ arụ nʼihi ịnọ ozu mmadụ nso. Gịnị ga-egbochi anyị iso ndị Izrel ndị ọzọ iwetara Onyenwe anyị onyinye nʼoge a kara aka?”
8Mosis zara sị ha, “Cherenụ ka m ga jụta Onyenwe anyị ihe bụ uche ya banyere mkpa unu.”