8“Nʼụbọchị ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya, “ọ bụ na mụ agaghị ala ndị oke amamihe niile nọ nʼEdọm nʼiyi, bụ ndị nwere mmụọ nghọta nọ nʼugwu Ịsọ?
9Ndị gị bụ dike nʼagha, o Teman, ka ụjọ ga-eri. Onye ọbụlakwa nọ nʼugwu Ịsọ niile, ka a ga-egbuda nʼagha.
10Nʼihi na i gbuola ma mesokwa nwanne gị bụ Jekọb ihe ike. Ihere ga-ekpuchi gị; a ga-alakwa gị nʼiyi ruo mgbe ebighị ebi.
11Nʼụbọchị ahụ, ị nọọrọ onwe gị, na-ele ndị ọbịa ka ha na-akwakọrọcha akụnụba ya, sitekwa nʼọnụ ụzọ ama ya gafee fee nza iji kerie Jerusalem. Ị dịkwa ka otu onye nʼime ha.
12Ma ị garaghị eleda nwanne gị anya nʼụbọchị nsogbu ya, ị garaghị aṅụ ndị Juda nʼụbọchị ahụ e bibiri ha. Ị garaghị anyara ha isi nʼụbọchị ahụ ha nọ na nsogbu.