8Ọ bụ ezie na-enwere m ike nʼime Kraịst inye gị iwu banyere ihe kwesiri ka i mee, ma agaghị m eme otu a.
9Kama, ọ kaara m mma site na ndabere nke ịhụnanya, ịrịọ gị ya dị ka arịrịọ. Ee, ọ bụ mụ Pọl, agadi nwoke ahụ na onye mkpọrọ nʼihi Kraịst Jisọs na-arịọ gị arịrịọ a.
10Biko, arịọ m gị nʼisi Onisimọs, onye e mere ka ọ bụrụ nwa m oge m nọ nʼụlọ mkpọrọ.
11Na mbụ, o nweghị uru ọbụla ọ baara gị, ma ugbu a, ọ baara mụ na gị uru.
12Ana m ezighachiri gị ya ugbu a, ya bụ, onye bụ obi m ka m na-ezitere gị.