Fịlịmọn 1

Ma eleghị anya, ọ bụ nʼihi nke a ka eji kewapụ ya nwa oge nta site nʼebe ị nọ, bụ ka i mesịa nweghachi ya ebighị ebi.

Philemon 1:15 (UKJV) For perhaps he therefore departed for a season, that you should receive him for ever;

13Ọ gụsịrị m agụụ ike ime ka mụ na ya nọdụ nʼebe a, ka o were ọnọdụ gị na-ejere m ozi ọ bụladị dị ka m nọ na mkpọrọ nʼihi oziọma.

14Ma, a chọghị m ime ihe ọbụla na-enwetaghị nkwenye gị, ka ọ ghara ịdị ka i mere obiọma gị na mmanye. Kama, achọrọ m ka i mee ihe si gị nʼobi pụta.

15Ma eleghị anya, ọ bụ nʼihi nke a ka eji kewapụ ya nwa oge nta site nʼebe ị nọ, bụ ka i mesịa nweghachi ya ebighị ebi.

16Ọ bụghịkwa ohu ọzọ, kama ọ karịrị ohu, maka ọ dịka nwanna a hụrụ nʼanya, ọkachasị nʼebe mụ onwe m nọ, ma ọ ga-abụkwara gị karịchasịa, ma nʼanụ ahụ nakwa nʼime Onyenwe anyị.

17Nʼihi nke a, ọ bụrụ na ị gụrụ m dị ka onye nnwekọ ihe, nabata ya dị ka ị ga-esi nabata m.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.