Ndị Filipai 1

Ọ bụ eziokwu na ụfọdụ ji ekworo na anya ụfụ na-ekwusa Kraịst, ma ụfọdụ kwa na-ezisa ya site nʼọchịchọ obi ziri ezi.

Philippians 1:15 (UKJV) Some indeed preach Christ even of envy and strife; and some also of good will:

13Nʼihi na ọ pụtala ihe nye ndị nche nke ụlọeze ahụ na onye ọbụla ọzọ, na ọ bụ naanị nʼihi na m bụ onye na-eso Kraịst ka e ji tụọ m mkpọrọ.

14Site na mkpọrọ a a tụrụ m, e meela ka ọtụtụ ụmụnna anyị bụrụ ndị nwere ezi ntụkwasị obi nʼime Onyenwe anyị, nwekwa oke nkwuwa okwu, izisa oziọma ahụ na-atụghị egwu ọbụla.

15Ọ bụ eziokwu na ụfọdụ ji ekworo na anya ụfụ na-ekwusa Kraịst, ma ụfọdụ kwa na-ezisa ya site nʼọchịchọ obi ziri ezi.

16Ndị ahụ ji ọchịchọ obi ziri ezi na-eme nke a nʼịhụnanya ebe ha matara na e tinyere m ebe a nʼihi izisa oziọma.

17Ndị mbụ ahụ na-ekwusa Kraịst site nʼọchịchọ obi nke onwe ha, ọ bụghị site nʼezi obi, ebe ha na-eche na ha ga-akpalị nsogbu nye m nʼime mkpọrọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.