21Nʼihi na nʼebe m nọ, ịdị ndụ bụ Kraịst, ịnwụ ọnwụ bụkwa uru.
22Ma ọ bụrụ na ịdị ndụ nʼanụ ahụ, nke a buuru m ịrụpụta ọrụ bara uru, enweghị m ike ikwu nke m ga-ahọrọ.
23Ụzọ ihe abụọ a na-eche m ihu: Ma ọchịchọ obi m bụ ịlakwuru Kraịst, nʼihi na ọ bụ nke kachasị mma.
24Ma ọ pụtara ihe na ọ dị mkpa nye unu ma ọ bụrụ na m adịrị ndụ nʼanụ ahụ.
25Ebe nke a doro m anya, amara m na mụ na unu niile ga-aga nʼihu ịnọ maka ọganihu na ọṅụ nke unu nʼime okwukwe.