28na-atụghị ụjọ ihe ndị na-emegide unu ga-eme. Iguzosi ike unu ga-agbara ha ezi ama banyere ịla nʼiyi nke ga-abịakwasị ha. Ma nʼebe unu nọ, ọ ga-abụrụ unu nzọpụta pụtara ihe nke sikwa nʼebe Chineke nọ bịa.
29Nʼihi na ohere ahụ e nyere unu, abụghị naanị ikwere na Kraịst, kama ọ bụkwa ịhụ ahụhụ nʼihi ya.
30Unu nọ na-agabiga ụdị ibu agha ahụ unu hụrụ na m gabigara, nke unu na-anụkwa na m ka nọ nʼime ya ugbu a.