18otu aka ahụ, unu onwe unu kwesiri inwe obi ụtọ ma sorokwa m ṅụrịa ọṅụ.
19Enwere m olileanya nʼime Onyenwe anyị Jisọs na m ga-ezitere unu Timoti nʼoge na-adịghị anya site ugbu a, ka m site nʼozi ọ ga-anata banyere unu nwee obi ụtọ.
20Enweghị m onye ọzọ dị ka ya, onye ga-eche ezi echiche maka ọdịmma unu.
21Nʼihi na ndị ọzọ na-echegbu onwe ha maka ọdịmma nke ha, ma ọ bụghị maka ọdịmma Jisọs Kraịst.
22Ma unu niile maara otu Timoti si dị oke mkpa. Ọ dị nnọọ dị ka nwa m, site nʼinyeaka ọ na-enyere m nʼọrụ izisa oziọma.