Ndị Filipai 2

Na mmekọrịta unu na ibe unu, nweenụ ụdị uche ahụ nke dị nʼime Jisọs Kraịst:

Philippians 2:5 (UKJV) Let this mind be in you, which was also in Christ Jesus:

3Emela ihe ọbụla nʼihi naanị ọdịmma nke gị, maọbụ bie ndụ nʼụzọ ịdọtara onwe gị otuto efu. Kama bụrụ onye wedara onwe ya ala, onye na-ahụ ndị ọzọ dị ka ndị ka ya mma.

4Echela echiche banyere naanị ihe metụtara gị, kama, na-eleba anya nʼihe banyere ndị ọzọ.

5Na mmekọrịta unu na ibe unu, nweenụ ụdị uche ahụ nke dị nʼime Jisọs Kraịst:

6Onye ọ bụ ezie na o nwere ụdịdị Chineke site na mmalite ma ọ gụghị ụdịdị ya dị ka Chineke dị ka ihe ọ ga-ejidesi aka ike.

7Kama, ọ gụrụ onwe ya dị ka ihe efu, site na ịnara ụdịdị nke onye bụ ohu, onye nke a mụrụ dị ka mmadụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.