Ndị Filipai 3

Naanị ihe m chọrọ bụ ịmara Kraịst na ike dị na mbilite nʼọnwụ ya, na nnwekọ nke isoro ya keta oke nʼahụhụ ya, nakwa ka m yie ya nʼọnwụ.

Philippians 3:10 (UKJV) That I may know him, and the power of his resurrection, and the fellowship of his sufferings, being made conformable unto his death;

8E, karịa nke a, akpọọla m ihe ndị a niile ihe efu, nʼihi na a pụghị iji ha tụnyere ịdị oke ọnụahịa nke ịmata Kraịst Jisọs, Onyenwe m. Nʼihi ya, etufuola m ihe ndị a niile, gụọ ha dị ka ihe na-abaghị uru, ka m nwee ike rite Kraịst nʼuru.

9Ka e nwee ike hụ m nʼime ya. Enweghị m ezi omume nke aka m, nke dabere nʼiwu, kama ọ bụ nke sitere nʼokwukwe na Kraịst, ezi omume si na Chineke nke dabeere nʼokwukwe.

10Naanị ihe m chọrọ bụ ịmara Kraịst na ike dị na mbilite nʼọnwụ ya, na nnwekọ nke isoro ya keta oke nʼahụhụ ya, nakwa ka m yie ya nʼọnwụ.

11Ka m si otu a, ruo nʼogo nke inweta mbilite site nʼọnwụ.

12Anaghị m ekwu na m etozuola oke, maọbụ nwezuo ihe niile. Ma a na m agbalịsi ike ka m jide ihe ahụ nke Kraịst Jisọs jidere m nʼihi ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.