19Ọ bụ Chineke m ga-egboro unu mkpa unu niile, site nʼụlọakụ ebube ya nke eluigwe, nʼihi Kraịst Jisọs.
20Ka otuto dịrị Chineke anyị, bụ Nna anyị, ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.
21Keleere m ndị nsọ niile nʼime Kraịst Jisọs. Ụmụnna ndị mụ na ha nọ na-ekelekwa unu.
22Ndị nsọ niile nọ nʼebe a na-ekele unu, karịsịa ndị nọ nʼụlọ Siza.
23Ka amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịnyere mmụọ unu. Amen.