19Otu a ka ọ na-adịkwara ndị ọ na-agụsị agụụ ike inweta akụnụba nʼụzọ na-ezighị ezi. Nʼihi na ịgbaso ụzọ dị otu a na-ewetara ndị na-eso ya ọnwụ.
20Amamihe na-eti mkpu nʼezi ka mmadụ nụ. Olu ya na-ada ụda nʼama.
21Ọ bụ nʼisi akụkụ ụzọ nke mkpọtụ dịkarịsịrị ka ọ na-akpọ oku, nʼọnụ ụzọ ama obodo ka ọ na-anọ ekwupụta okwu ọnụ ya niile.
22“Unu ndị na-enweghị uche ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide bụrụ ndị ga-ahụ enweghị uche nʼanya? Ruo ole mgbe ka ndị na-akwa emo ga-anọgide na mmasị ịkwa emo? Ruo ole mgbe ka ndị nzuzu ga-anọgide na-akpọ ihe ọmụma asị?
23Ọ bụrụ na unu gere ntị na mba m na-abara unu, aga m awụpụ echiche niile nke obi m nye unu, aga m emekwa ka unu mara okwu m.