17Onyeozi ajọ omume na-adaba na nsogbu, ma onyeozi kwesiri ntụkwasị obi na-eweta ọgwụgwọ.
18Onye na-ajụ ịdọ aka na ntị ga-anwụ nʼụkpa na nʼihere; ma onye na-anabata ịdọ aka na ntị ka a ga-asọpụrụ.
19Mgbe ihe a na-ele anya mezuru ọ na-atọ mkpụrụobi ụtọ, ma ndị nzuzu kpọrọ isite nʼajọ ihe wezuga onwe ha asị.
20Na-eso ndị maara ihe ka ị ghọọ onye mara ihe, nʼihi na onye na-eso ndị nzuzu na-aba na nsogbu.
21Nsogbu bụ ihe na-esogharị ndị mmehie, ma ngọzị na-esogharị ndị ezi omume.