20Na-eso ndị maara ihe ka ị ghọọ onye mara ihe, nʼihi na onye na-eso ndị nzuzu na-aba na nsogbu.
21Nsogbu bụ ihe na-esogharị ndị mmehie, ma ngọzị na-esogharị ndị ezi omume.
22Mgbe ezi mmadụ nwụrụ, ọ na-ahapụrụ ụmụ ya na ụmụ ụmụ ya akụ, ma mgbe onye mmehie nwụrụ, akụ ya na-abụ nke ndị ezi omume.
23Ubi onye ogbenye pụrụ inwe ọtụtụ ihe oriri, ma ikpe na-ezighị ezi na-azachapụ ya.
24Onye ọbụla na-adọghị ụmụ ya aka na ntị, na-egosi na ọ hụghị ha nʼanya; ma onye hụrụ ha nʼanya, ga-adọsi ha aka na ntị ike.