14Esemokwu malite ọ na-esi ike imedo ya, nʼihi ya ekwela ka ọ malite.
15Onye na-asị onye ikpe maara na ikpe amaghị ya na-amakwa onye aka ya dị ọcha ikpe, Onyenwe anyị na-akpọ omume abụọ a asị.
16Uru gịnị ka ego bara nʼaka onye nzuzu; ebe ọ bụ na o nweghị ike ịchọ amamihe.
17Ezi enyi na-egosi ịhụnanya ya nʼoge ọbụla. Otu a kwa, nwanne na-aba uru nʼoge mkpa.
18Ọ bụ uche ezughị oke ịnara ụgwọ onye ọzọ ji, si otu a ghọọ onye ji ụgwọ.