1Ọ ka mma ịta iberibe achịcha kpọrọ nkụ ma ịnọ nʼudo adị ya, karịa nʼụlọ jupụtara nʼoke oriri na ịlụ ọgụ.
2Ohu nwere uche ga-achị nwa nna ya ukwu na-eweta ihere ma ketakwa oke nʼihe nketa dịka otu nʼime ndị ezinaụlọ ahụ.
3Ite eji anụcha ihe dịrị ọlaọcha, oke ọkụ dịkwara ọlaedo ma Onyenwe anyị na-anwale obi.
4Ajọ mmadụ na-aṅa ntị nʼegbugbere ọnụ na-eduhie, onye ụgha na-aṅakwa ntị nye ire na-ekwu okwu ịla nʼiyi.