18Ọ bụ uche ezughị oke ịnara ụgwọ onye ọzọ ji, si otu a ghọọ onye ji ụgwọ.
19Onye na-ahụ esemokwu nʼanya hụrụ mmehie nʼanya. Onye na-ewuli ọnụ ụzọ ama ya elu na-akpọ ntipịa oku.
20Ọ dịghị aga nʼihu bụ onye obi ya gbagọrọ agbagọ. Onye nwere ire nrafu ga-adanye na nsogbu.
21Ọ bụ naanị iru ụjụ na obi ọjọọ dịịrị nna nke nwa ya na-eme ihe nzuzu.
22Obi nke na-aṅụrị ọṅụ na-eme ka ahụ sie ike, ma mmụọ na-eru ụjụ oge niile na-akpata ọrịa.