3Ite eji anụcha ihe dịrị ọlaọcha, oke ọkụ dịkwara ọlaedo ma Onyenwe anyị na-anwale obi.
4Ajọ mmadụ na-aṅa ntị nʼegbugbere ọnụ na-eduhie, onye ụgha na-aṅakwa ntị nye ire na-ekwu okwu ịla nʼiyi.
5Onye ọbụla na-akwa ogbenye emo ọ bụ Chineke kere ha ka ọ na-elelị anya. Ndị niile na-aṅụrị ọṅụ nʼihi ihe ike dakwasịrị ha aghaghị ịta ahụhụ.
6Ụmụ ụmụ bụ okpueze ndị okenye. Nne na nna bụ ịnya isi nke ụmụ ha.
7Egbugbere ọnụ na-ekwu okwu dị mma abụghị nke onye nzuzu, otu a kwa, egbugbere ọnụ na-agha ụgha ekwesighị ịbụ nke onye na-achị achị.