Ilu 17

Nʼanya onye na-enye ngarị ọ na-ahụta ya dịka ọgwụ ịrata mmadụ, ha na-eche nʼebe ọbụla ha chere ihu ihe ga-aga nke ọma.

Proverbs 17:8 (UKJV) A gift is as a precious stone in the eyes of him that has it: anywhere it turns, it prospers.

6Ụmụ ụmụ bụ okpueze ndị okenye. Nne na nna bụ ịnya isi nke ụmụ ha.

7Egbugbere ọnụ na-ekwu okwu dị mma abụghị nke onye nzuzu, otu a kwa, egbugbere ọnụ na-agha ụgha ekwesighị ịbụ nke onye na-achị achị.

8Nʼanya onye na-enye ngarị ọ na-ahụta ya dịka ọgwụ ịrata mmadụ, ha na-eche nʼebe ọbụla ha chere ihu ihe ga-aga nke ọma.

9Onye ọbụla na-akwado ịhụnanya na-ekpuchi njehie, ma onye na-ekwu ihe mere mgbe na mgbe na-ekewa ezi enyi.

10Ịba mba ntakịrị a baara onye nwere nghọta bara uru karịa narị ụtarị nke a pịara onye nzuzu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.