25ma ọ bụghị ya, i nwere ike ịmụta ndụ ha, si otu a tinye ndụ gị na nsogbu.
26Abụla onye otu nʼime ndị na-anara ndị mmadụ akaebe maọbụ kwee nkwa ikwu ụgwọ onye ọzọ ji.
27Nʼihi na ọ bụrụ na i nweghị ego ị ga-eji kwụọ ụgwọ ahụ, a ga-anapụ gị ọ bụladị ihe ndina gị.
28Ehigharịla oke ala e tinyere site na mgbe ochie. Nke ndị nna ochie gị ha hiwere.
29Ị hụrụ mmadụ ahụ nke nwere ǹka nʼịrụ ọrụ ya nke ọma? Ọ ga-eguzo nʼihu ndị eze, ọ gaghị eguzo nʼihu ndị a na-amaghị aha ha.