16Ọ bụ naanị eze na-amaghị ihe ga-akpagbu ndị ya; ma eze ga-achị ogologo oge bụ eze kpọrọ iri ngarị asị.
17Obi ogbu mmadụ ga na-ama ya ikpe ruo ala mmụọ. Ka onye ọbụla ghara inyere ya aka.
18Onye na-eje ije na-enweghị ịta ụta ka a na-echebe, ma onye ụzọ ya gbagọrọ agbagọ ga-adaba nʼolulu.
19Onye na-arụ ala ubi ya ga-enwe nri nʼebe ọ bara ụba, ma onye na-agbaso ihe efu dị iche iche, ụbịam ga-eju ya afọ.
20Onye ọbụla nke kwesiri ntụkwasị obi ga-enweta ọtụtụ ngọzị, ma nwoke ahụ na-achọ ịbụ ọgaranya ngwangwa aghaghị inweta ntaramahụhụ.