Ilu 30

“Ihe anọ dị nke dị nta nʼelu ụwa, ma ha maa ihe nke ukwuu.

Proverbs 30:24 (UKJV) There be four things which are little upon the earth, but they are exceeding wise:

22Ohu ghọrọ eze, onye nzuzu ihe na-agara nke ọma,

23nwanyị obi ilu mesịrị lụta dị, na odibo nwanyị ghọrọ nwunye nna ya ukwu.

24“Ihe anọ dị nke dị nta nʼelu ụwa, ma ha maa ihe nke ukwuu.

25Ndanda bụ ndị na-enweghị ume, ma ha na-akpakọta nri ha, dozie nke ha ga-eri nʼoge oyi.

26Ewi nkume bụ ndị na-adịghị ike, ma ha na-echebe onwe ha site nʼibi nʼọgba nkume.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.