12Ihe nwanyị dị otu a na-ewetara di ya bụ naanị ihe ọma. Ihe ọjọọ ọbụla adịghị esi nʼaka ya abịakwasị di ya ụbọchị niile nke ndụ ya.
13Ọ na-ahọrọ ajị anụ na flakisi jiri ya na-arụ ọrụ na-atọ aka ya ụtọ.
14Ọ na-esite nʼebe dị anya na-ebubata ihe oriri nʼụlọ ya dịka a ga-asị na ọ bụ ụgbọ mmiri.
15Tupu chi abọzie, nwanyị a esitelarị nʼihe ndina bilie kwadooro ezinaụlọ ya ihe oriri, ma debekwara odibo ndị inyom na-ejere ya ozi oke ihe oriri nke ha.
16Ọ na-apụ nyochapụta ịdị mma ala ubi, ma zụpụta ya. Ọ bụ ego ọ rụpụtara nʼonwe ya ka o ji arụ ọrụ ubi vaịnị.