23Nke ka nke, lezie echiche uche gị niile anya, nʼihi na ha na-emetụta ndụ gị niile.
24Ka ụgha ọbụla ghara isi gị nʼọnụ pụta; kpọọ ịgha ụgha niile na okwu rụrụ arụ niile asị.
25Legide anya nʼihu ime ihe bụ eziokwu; atụgharịkwala isi gị ile ihe ọbụla.
26Leruo ije ụkwụ gị anya, doziekwa ụzọ gị niile ka ọ guzozie.
27Ewezugala onwe gị site nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe; si nʼihe ọjọọ wezuga ụkwụ gị.