9Ọ bụ ruo ole mgbe ka ị ga-edina ala nʼebe ahụ, gị onye umengwụ? Olee mgbe ka ị ga-esi nʼụra bilie?
10Nwa ụra nta, nwa iru ụra nta, nwa ịchịkọba aka nta zuo ike,
11ụbịam ga-abịakwasị gị dịka onye ohi, ụkọ abịakwasịkwa gị dịka onye na-apụnara mmadụ ihe.
12Onye okwu na ụka na onye omume ya jọgburu onwe ya, onye na-ejegharị na-ekwu okwu aghụghọ,
13onye ji iro na-egbu ikuanya ya, jiri ụkwụ ya na-ekwu okwu na mkpịsịaka ya na-egosi ihe.