22Mgbe ị na-ejegharị, ọ ga na-edu gị; mgbe ị na-arahụ ụra, ọ ga na-eche gị. Mgbe i tetakwara, ha ga-akpanyere gị ụka.
23Nʼihi na iwu a bụ oriọna, Ihe ozizi a bụkwa ìhè, otu a kwa ịdọ aka na ntị na ịba mba bụ ụzọ ezi ndụ,
24idebe gị ka ị pụọ nʼebe nwunye onye agbataobi gị nọ, sitekwa nʼire ụtọ nke nwanyị ọjọọ.
25Ekwela ka agụ nʼezighị ezi gụọ gị nʼime obi nʼihi ịma mma ya, ma ọ bụkwanụ ka o jiri ile anya ya rata gị.
26Nʼihi na nwanyị akwụna ka enwere ike iji otu ogbe achịcha nweta, ma nwunye nwoke ọzọ na-achụ nta ndụ gị ịla ya nʼiyi.