14Ma gị, O Chineke, ị na-ahụ nsogbu na ihe mwute, ị na-atule ihe ị ga-eme banyere ha. Ndị a na-emegbu na-atụkwasị gị obi, nʼihi na ị bụ onye inyeaka ndị na-enweghị nna.
15Gbajie aka onye ajọ omume a na-eme ihe ọjọọ, kpọọ ya ka ọ zaa ajụjụ banyere ajọ omume ya niile nke a na-apụghị ịchọpụta.
16Onyenwe anyị bụ eze ruo mgbe ebighị ebi. Ọ ga-esite nʼala ya kpochapụ mba niile.
17O Onyenwe anyị, ị maara ọchịchọ obi ndị niile a na-akpagbu; ị na-ege ntị na mkpu akwa ha ma kasịekwa ha obi,
18Ị na-echedo ndị na-enweghị nna na ndị niile a na-emegbu emegbu, ka mmadụ efu, onye e kere eke, ghara imenye ha egwu ọzọ.