24Ike agwụla ikpere m, nʼihi ibu ọnụ; ataakwala m ahụ, bụrụ naanị ọkpụkpụ.
25Aghọọla m onye e ji eme ihe ọchị nye ndị na-ebo m ebubo, mgbe ha hụrụ m, ha na-efufe isi ha.
26Nyere m aka, o Onyenwe anyị Chineke m; zọpụta m dịka ịhụnanya gị si dị.
27Ka ha mara na ọ bụ aka gị, na ọ bụ gị, o Onyenwe anyị, mere ya.
28Ha nwere ike nọgide na-abụ ọnụ, ma ị ga-agọzi; mgbe ha ga-abịa ọgụ, a ga-eme ha ihe ihere, ma ohu gị ga-aṅụrị ọṅụ.