1Toonu Onyenwe anyị! Aga m eji obi m niile jaa Onyenwe anyị mma nʼime nzukọ ndị ụzọ ha ziri ezi na nʼime ọgbakọ ukwuu.
2Ọrụ niile Onyenwe anyị na-arụ dị ukwuu; ndị niile na-enwe mmasị na ha na-atụgharị uche nʼime ha.
3Ọrụ ya jupụtara nʼebube na ịma mma, ezi omume ya na-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi.
4O meela ka e cheta ọrụ ebube ya niile; Onyenwe anyị bụ onye amara na onye ọmịiko.
5Ọ na-egboro ndị na-atụ egwu ya mkpa ihe oriri; ọ na-echetakwa ọgbụgba ndụ ya ruo mgbe ebighị ebi.