3Osimiri hụrụ ya, gbaa ọsọ, osimiri Jọdan hụkwara ya chigharịa laa azụ;
4Ugwu ukwu niile wụliri elu dịka ebule; ugwu nta niile wụlikwara elu dịka ụmụ atụrụ.
5Gịnị mere gị oke osimiri, i ji na-agba ọsọ? Osimiri Jọdan, gịnị na-eme gị i ji chigharịa laa azụ?
6Gịnị na-eme unu, ugwu ukwu niile unu ji na-awụli elu dịka ụmụ ebule? Gịnị na-emekwa unu, ugwu nta niile, unu ji na-awụli elu dịka ụmụ atụrụ?
7Ka ụwa niile maa jijiji nʼihu Onyenwe anyị, ka ọ maakwa jijiji nʼihu Chineke nke Jekọb,