Abụ Ọma 127

Ọ bụrụ na Onyenwe anyị ewughị ụlọ, ndị na-ewu ya na-adọgbu onwe ha nʼọrụ nʼefu. Ọ bụrụ na Onyenwe anyị echeghị obodo, nʼefu ka ndị nche na-amụ anya.

Psalm 127:1 (UKJV) Except the LORD build the house, they labour in vain that build it: except the LORD keep the city, the watchman wakes but in vain.

1Ọ bụrụ na Onyenwe anyị ewughị ụlọ, ndị na-ewu ya na-adọgbu onwe ha nʼọrụ nʼefu. Ọ bụrụ na Onyenwe anyị echeghị obodo, nʼefu ka ndị nche na-amụ anya.

2Ọ bụ nʼefu ka ị na-ebili nʼisi ụtụtụ na-adọgbu onwe gị nʼọrụ ịchọta ihe ị ga-eri ruo nʼabalị, nʼihi na ọ na-eme ka ndị niile ọ hụrụ nʼanya hie ụra nʼudo.

3Ụmụntakịrị bụ ihe nketa si nʼaka Onyenwe anyị, ụmụntakịrị bụ ụgwọ ọrụ ọ na-enye.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.