Abụ Ọma 14

Mmadụ niile ewezugala onwe ha, ha niile abụrụla ndị ajọ omume riri ahụ; ọ dịghị onye ọbụla na-eme ihe ziri ezi, ọ dịghị ọ bụladị, otu onye.

Psalm 14:3 (UKJV) They are all gone aside, they are all together become filthy: there is none that does good, no, not one.

1Onye nzuzu na-asị nʼime obi ya, “Ọ dịghị Chineke ọbụla dị.” Ha bụ ndị ajọ omume riri ahụ, ọrụ aka ha niile bụkwa ihe arụ; ọ dịghị onye ọbụla na-eme ezi ihe.

2Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe na-ele ụmụ mmadụ anya ịhụ ma ọ ga-achọta onye ọbụla nwere nghọta onye nke na-achọ Chineke.

3Mmadụ niile ewezugala onwe ha, ha niile abụrụla ndị ajọ omume riri ahụ; ọ dịghị onye ọbụla na-eme ihe ziri ezi, ọ dịghị ọ bụladị, otu onye.

4Ndị niile na-eme ajọ ihe, ha amaghị ihe? Ha na-eripịa ndị m dịka mmadụ si eri nri, ha adịghị akpọkukwa Onyenwe anyị.

5Ma nʼebe ahụ ka ha nọ, nʼọnọdụ oke egwu, nʼihi na Chineke nọ nʼetiti ndị ezi omume.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.