1O Onyenwe anyị, dọpụta m site nʼaka ndị na-eme ihe ọjọọ. Chebe m ka m ghara ịdaba nʼaka ndị na-eme ihe ike dị iche iche.
2Ndị na-atụ atụmatụ ime ihe ọjọọ nʼobi ha na-akpali agha ụbọchị niile.
3Ha na-eme ire ha ka ha dị nkọ dịka nke agwọ; elo ajụala dị nʼegbugbere ọnụ ha. Sela
4Chebe m Onyenwe anyị, ka m ghara ịdaba nʼaka ndị na-emebi iwu; chebe m ka m ghara ịdaba nʼaka ndị na-eme ihe ike, ndị na-eche echiche ọdịda m.