7Jirinụ ekele bụkuo Onyenwe anyị abụ; jirinụ ụbọ akwara kpọọrọ Chineke anyị egwu.
8Ọ na-eji igwe ojii na-ekpuchi mbara eluigwe; ọ na-ewetara elu ụwa mmiri ozuzo na-eme ka ahịhịa puo nʼelu ugwu niile.
9Ọ na-enye ehi niile nri na-enyekwa ụmụ ugolọma nri mgbe ha na-ebeku ya akwa nʼihi nri.
10Mmasị ya adịghị nʼike nke ịnyịnya, maọbụ nʼike ụkwụ nke mmadụ.
11Onyenwe anyị na-enwe mmasị nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ, ndị olileanya ha dị na ịhụnanya ya nke na-adịghị agharịpụ.