9unu ugwu ukwu niile, na ugwu nta niile na osisi niile na-amị mkpụrụ na osisi sida niile
10na anụ ọhịa, na anụ ụlọ niile, na ihe niile na-akpụ akpụ nʼala na nnụnụ niile,
11ndị eze niile nke ụwa na mba niile dị iche iche, unu ụmụ eze na ndị niile na-achị achị nʼụwa,
12ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọ, ndị okenye na ụmụntakịrị.
13Ka ha niile too aha Onyenwe anyị, nʼihi na ọ bụ naanị aha ya ka e buliri elu; ebube ya dị ukwuu karịa eluigwe na ụwa.