1Ka Onyenwe anyị zaa gị nʼụbọchị nsogbu gị; ka aha Chineke nke Jekọb chebe gị.
2Ya sitekwa nʼebe nsọ ya zitere gị inyeaka, ma site na Zayọn kwagide gị.
3Ya chetakwa aja niile ị chụrụ, ma nabata aja nsure ọkụ niile ị chụrụ nye ya. Sela
4Ya mezukwara gị ihe niile nke obi gị na-achọ, mekwaa ka atụmatụ gị niile gaa nke ọma.