Abụ Ọma 27

Mgbe ndị na-eme ihe ọjọọ busoro m agha ka ha ripịa anụ ahụ m, ọ bụ ndị iro m na ndị kpọrọ m asị, bụ ndị ga-asọ ngọngọ ma dakwaa.

Psalm 27:2 (UKJV) When the wicked, even mine enemies and my foes, came upon me to eat up my flesh, they stumbled and fell.

1Onyenwe anyị bụ ìhè m na nzọpụta m, onye ka m ga-atụ egwu ya? Onyenwe anyị bụ ebe siri ike nke ndụ m, ọ bụkwa onye ka m ga-atụ egwu?

2Mgbe ndị na-eme ihe ọjọọ busoro m agha ka ha ripịa anụ ahụ m, ọ bụ ndị iro m na ndị kpọrọ m asị, bụ ndị ga-asọ ngọngọ ma dakwaa.

3Ọ bụrụ na usuu ndị agha agbaa m gburugburu, obi m agaghị atụ ụjọ ọbụla; ọ bụladị na agha adaa imegide m, nʼoge ahụ, ka m ga-enwe ntụkwasị obi.

4Naanị otu ihe ka m rịọrọ nʼaka Onyenwe anyị, nke ahụ bụkwa ihe m na-achọsi ike; ka m biri nʼụlọ Onyenwe anyị ụbọchị niile nke ndụ m, na ka m lekwasị ịma mma Onyenwe anyị, na ka m chọọ ya nʼime ụlọnsọ ukwuu ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.